Kwa afọ, a na emefu ijeri dollar na ego gọọmenti etiti nwepụtara na ụlọ ọgwụ, ngalaba ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọkụ ọgbụgba, ụlọ akwụkwọ, okporo ụzọ, na akụrụngwa ndị ọzọ dabere na ozi nke ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ.
Nsonaazuụ nke ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ ga-ekpebi nọmba nke okwa steeti ọ bụla ga-enwe n’ime Nzukọ ndị Ome iwu nke U.S, a na eji ha kee oke maka ebe ntuli aka.
Akwụkwọ iwu nke ndị obodo United Steeti na achọkwa ọnụọgụgụ ndị mmadụ: Edemede nke 1, Nkeji 2, manyere na obodo United Steeti ga-eme ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ otu ugboro kwa afọ 10. Ọnụọgụgụ nke mbụ mere na afọ 1790.
Iwu megidere na Ngalaba Gọọmenti maka Ọnụọgụgụ ndị mmadụ ga-echekwa aziza gị ma debe ha naanị n’ozuzo. N ‘ezie, onye oru niile na anụ iyi iji chekwa ozi onwe gị rue ebighi ebi.
N’okpuru Isiokwu iri na ato nke ndị Koòdù U.S., Ngalaba Gọọmenti maka Ọnụọgụgụ ndị mmadụ agaghị enye ozi o bula aga amata banyere gị, ezinụlọ gị, màọbụ azụmahịa gị, obuladi nye ndị ụlọ oru na amanye iwu. Iwu na agba mbò ihu na echekwara data ọnụọgụgụ onwe gị ma agaghị eji aziza gị emegide gị site na ụlọ oru goomenti màọbụ uloikpe.
Nke a bu nke kwesiri ime na Ọnụọgụgụ ndị mmadụ na afọ 2020. I nwere ike ihu ndị oru ọnụọgụgụ ndị mmadụ na ebe gị maka ihe ole ma ole kpatara ya:
Na ọnwa Maa n’afọ 2020, ndị na ewere ọnụọgụgụ nke mmadụ ga ebido n’aga n’ulo ndị na azaghachibeghi na Ọnụọgụgụ ndị mmadụ na afọ 2020 iji gbaa mbò hu na agụnyere onye o bula.
I nwere ike inyere anyị aka site na ikekorita ozi Ngalaba Gọọmenti maka Ọnụọgụgụ ndị mmadụ na ozi ya na ndị enyi gị, ezinụlọ nà ndị na eso gị na Fac